Ncheta Emume nke Our Lady of Lourdes - Green/White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 1:20 - 2:4a
-
Abụọma na azịza ya
Ps 8: 4-5, 6-7, 8-9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 7:1-13
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Gn 1:20 - 2:4a
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
Chineke sịkwara, "Ka osimiri wepụta ụmụ anụ ndị na-egwu mmiri, nakwa ụmụ nnụnụ na-efegharị na mbara igwe." Chineke abịakwazị kee nnukwu anụ ndị ahụ bi n'oke osimiri, nakwa anụ niile dị ndụ na-agagharị agagharị, ndị nke mmiri na-ebuga n'ụdị ha, nakwa nnụnụ igwe niile nwere nku n'ụdị ha. Chineke hụkwara na ọ dị mma. Chineke gọziri ha sị, "Nwee nu mkpụrụ nke afọ, mụbaa nu ka unu jupụta n'ime osimiri niile, ka ụmụ nnụnụ igwe mụbàa n'elu ụwa." Mgbede bịara, ụtụtụ bịakwazị: ụbọchị nke ise.
Chineke sịkwara, "Ka ụwa wepụta anụ ndị dị ndụ n'ụdị ha niile, anụ ụlọ, ihe niile na-arị arị na anụ ọhịa niile n'ụdị ha niile." Ọ mere otu ahụ. Chineke kekwara anụ ọhịa niile nke ụwa n'ụdị ha, nakwa anụ ụlọ niile n'ụdị ha, nakwa ihe niile na-akpụ akpụ n'ala n'ụdị ha. Chineke hụkwara na ọ dị mma.
Chineke sịkwa, "Ka anyị kee mmadụ n'oyiyi anyị na n'ụdị anyị, ka ha nwee ike ọchịchị n'ebe azụ mmiri niile dị, n'ebe nnụnụ igwe niile dị, n'ebe anụ ụlọ niile dị, n'ebe ụwa niile dị, nakwa n'ebe ihe niile e kere eke ji afọ aga ije n'elu ụwa dị." Ya mere, Chineke kere mmadụ n'oyiyi onwe ya, n'oyiyi Chineke ka o kere ya, nwoke na nwaanyị ka o kere ha. Chineke gọziri ha sị ha, "Nwee nu mkpụrụ nke afọ, mụbaa nu, jupụta n'ime ụwa ma chịa ya; nwee nu ike ọchịchị n'ebe azụ dị n'ime osimiri dị, n'ebe nnụnụ nke igwe dị, nakwa n'ebe ihe niile dị ndụ na-agagharị agagharị n'elu ụwa dị."
Chineke sịkwara, "Lee, enyela m gị osisi niile na-amịpụta mkpụrụ nke dị n'elu ụwa niile, na mkpụrụ osisi niile na-amịpụta mkpụrụ; ị ga-ewere ha dị ka nri gị. Enyekwala m gị anụ ọhịa niile dị n'elu ụwa, nnụnụ niile na-efe n'elu, na ihe niile na-akpụ akpụ n'elu ala, ihe niile nwere ndụ ka ọ bụrụ ihe oriri gị." Ọ mere otu ahụ. Chineke hụrụ ihe niile o kere, hụ na ọ dị mma n'ezie. Mgbede bịara, ụtụtụ bịakwazị: ụbọchị nke isii.
Ya bụ, e kechara Eluigwe na ụwa na ihe niile dị n'ime ya. Ka Chineke rụchara ọrụ okike nke ọ na-arụ, o zuru ike n'ụbọchị nke asaa. Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ wee doo ya nso, n'ihi na ụbọchị ahụ, Chineke zuru ike mgbe o rụchara ọrụ okike ya. Nke a bụ usoro akụkọ Eluigwe na ụwa dịka e si kee ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 8: 4-5, 6-7, 8-9
Azịza: Onyenwe anyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n'ụwa niile.
1. M lee anya n'eluigwe i ji aka gị mere,
ya na ọnwa na kpakpando i kere,
gịnị ka mmadụ bụ ji eche echiche banyere ya,
nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya?
Azịza: Onyenwe anyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n'ụwa niile.
2. N'agbanyeghị, i mere ka ọ jiri obere ihe karịrị ndị mmụọ ozi nta,
i jikwa ùgwù na nsọpụrụ chọọ ya mma dị ka eze.
I mere ya nna ukwu ihe niile e kere eke,
were ihe niile dobe n'okpuru ya.
Azịza: Onyenwe anyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n'ụwa niile.
3. Ọ na-achị ụmụ atụrụ na ehi,
na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile.
Ọ na-achị ụmụ nnụnụ nke igwe,
azụ dị na mmiri na anụ ndị ọzọ dị n'osimiri.
Azịza: Onyenwe anyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n'ụwa niile.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
"Were nu nwayọ nara okwu ahụ nke a kọụrụ n'obi unu dị ka mkpụrụ,
nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụ obi unu."
Alleluia
OZIỌMA : Mk 7:1-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ si na Jerusalem bịakwutere Jisọs, ha chọpụtara na ụfọdụ n'ime ndị na-eso ụzọ ya na-eri ihe n'aka ruru arụ, ya bụ, ha adịghị akwọ aka ha. N'ihi na ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri ihe n'ebughị ụzọ kwọ aka ha dịka omenala ndị okenye ha si dị. Ọzọ, ọ bụrụ na ha alọtaghị ahịa, ha adịghị eri ihe n'ebughị ụzọ dị ọcha. Ọ nwekwara omenala ndị ọzọ ha na-edebe, dịka ịsa iko, na ite, na iko ọlanchara.Ya mere, ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ jụrụ Jisọs sị, "Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị eso omenala ndị okenye, kama ha na-eri ihe n'akwaghị aka dịka usoro si dị?" Ma o siri ha, "Aịzaya bụzị amụma nke ọma banyere unu ndị ihu abụọ, dịka e dere ya n'akwụkwọ si, 'Ndị a na-asọpụrụ m n'egbugbere ọnụ ha, ma obi ha dị anya n'ebe m nọ; n'efu ka ha na-akpọ isiala enye m, na-akụzi nkụzi nke mmadụ ka ọ bụ iwu nke Chineke.'"Unu hapụrụ iwu nke Chineke jidesie aka ike n'omenala nke mmadụ." O wee sikwa ha, "Unu nwere ụzọ aghụghọ unu si aju idebe iwu Chineke, ka unu wee nwee ike idebe omenala unu natara! N'ihi na Mosis sịrị, 'Sọpụrụ nna gị na nne gị,' kwukwaa sị, 'Onye ọ bụla kwujọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya kwesịrị igbu ya.' Mana unu na-akụzi sị, 'Ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya ma ọ bụ nna ya, ihe i nwere ike inweta n'aka m bụ 'Koban,' ya bụ ihe e nyere Chineke, iwu ejighikwa ya ozo inyere nne ya ma ọ bụ nna ya aka.' N'ụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu site na ihe unu na-eme kwa."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu